Full Lyrics
REFRAIN
Egbe bere; ugo bere, nke sị ibe ya ebela nku kwaa ya!
Obinwanne k'anyị nachọ; ịdịnotu amaka! Egbe beka!
VERSE 1
Kedu ife na ese r'anyị o?
Kedu ife anyị ji egbusịo nwea anyị o!
K'anyị nwee nu ofu obio, n'anyị bụ ofu ịdịn'otu amaka!
VERSE 2
Anọchiiri m'onye anya? chei!
Anọchiiri m'onye anya?
M mejọọ nụ gị biko gbagharamo
n'ụtọ bụ eleta aghara!
VERSE 3
Ọgaranya biri, ogbenye biri;
okoro biri, agbọghọ bịa biri;
ndụ mmiri, ndụ azụ;
nke onye chiri ya biko zere!
Ngụ onye ji eko, ya biko akwala hụla ya doo!
n'igwe bụ ike!
VERSE 4
Kedu ihe m mere gị'i ji kpụrụ m n'ọnụ?
Kedu ihe m mere gị'i jiero m'iro?
Ọkwa nụ otu Chukwu kere gị kere mo;
I biri m'ebirio.