EZIGBO NNE by Ifeanyichukwu Eze — Lyrics

Ifeanyichukwu Eze Igbo Mothers song Celebrations Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Nne mo! ezigbo nne nne ọma Nne mo! ezigbo nne nne ọma nụlịba, golibe na Chinek'agọzigo gị, nne ọma. nụlịba, golibe na Chinek'achọgọ gị mma nne ọma. VERSE 1 Tupu a mụọ m nne buru m n'afọ; ọ gabigara ihe mgbu nke ime n'obi ọcha, nụlịba, golibe na Chinek'ebuligo gị elu, nne ọma, nụlịba, golibe na Chi chọrọ gị mma nne ọma. VERSE 2 Ị ma n'agụụ gụba m, nne m n'achọrọ m nri ka m rie, ka m rie k'obi dị m mma mgbe nile. Ochie dike Chukwu chekwaba gị nne ọma. VERSE 3 Ahụ rịaba m, ọ n'ewetaba nne m. Ọ g'enye m'ọgwụ ka m ṅụọ, kpeekpere ka m dị mma. Yọọ Chineke Nna ka Ọgwụọ m ọrịa ji m. VERSE 4 Ihe ọbụl'ị bụ n'ụwa biko leta nne gị anya n'ihi ahụhụ nil'ọtara ma k'ị zụnite gị. Chetakwa na nne dị nsọ dịkw'ụkọ. VERSE 5 Chukwu k'er'ụwa biko gọzibe ndị nne nye h'aṅụlị zuru oke n'ezin'ụlọ ha were ngọzi si n'igwe n'ezo ka mmiri saa h'arụ.

Download the sheet music

EZIGBO NNE

EZIGBO NNE

By Ifeanyichukwu Eze
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
4 Downloads
Mothers song Celebrations
0 0

More lyrics you may want