Full Lyrics
REFRAIN
Tata bụ ụbọchị Chineke mebere
ndị dị ngọzi nke ya
Nye y'ofufe n'ụlọ ya
Nye y'ofufe n'ụlọ ya dị asọ
Bịanụ k'anyị kpọọ isiala nye Chineke
Onye ker'anyị
Bịanụ k'anyị kpọọ isiala nye Chineke
Onye kachị elu
VERSE 1
Chukwu anyị dị mma
Lee kene k'osiri kee mmadụ
Nye y'echiche nye y'ọgụgụ isi chọọ ya mma,
mana mmadụ n'ejehị ụzọ site n'iwere nsọpụrụ
dịrị sọ Chukwu na enye ihe kere ke
VERSE 2
O Chineke, lee ụmụ gị
ndị bịar'inye gị ekele
meghe ntị anyị k'anyị
nụrụ ozi ọma gị
gbaghara nmehie anyị nile
VERSE 3
N'ebe kacha elu
Nye ya nye otito
Ọ bụ ya mere k'anyị dindụ
n'ezie nye ya nye y'otito
mekwa ka mba nile dị n'ụwa nweta nzọpụta
nye ya nye y'otito
Mba nile wee nweta nzọpụta n'ime Kristi
nye ya nye y'otito
Bịanụ k'anyị kpọọ isiala
nye Chineke Onyenwe m na Chineke Nna m
Onye kach'elu
N'ebe kacha elu
otito n'ebe kach'elu