Full Lyrics
[REFRAIN]
Nuria n'ihe ọñụ emegonu!
Nuria na amụrụ Nwa ka nwa eh!
K'anyi jee na Bethlehem ngwa ngwa
K'anyi jee zute Nnwa ka nwa!
Bịa nụ k'anyi jee ụmụnne m zute Nwa ka nwa.
K'anyi jeenu k'anyi jeenu k'anyi jeenu ee zute Nwa ka nwa.
Bịa lelee Nwa Chineke lelee
Nwa ka nwa onye nzọpụta nk'ụwa
Eze a mụrụ ọhụ.
[VERSE 1]
Bụ ọñụ a bụ n'ihe akụkọ meere anyị ru
Chineke abịago n'ụwa ileta anyị o!
Ọtito dịrị Chineke n'elu kachasị elu
N'ụwa udo dịrị ndị ihe ha naasọ Chukwu.
[VERSE 2]
Mary Nne Chukwu amụgo onye nzọpụta,
Ọ bụ Jesu Kristi, Eze nk'ụwa nile!
Emmanuel Emmanuel Emmanuel
Chukwu nọnyere anyị.
[VERSE 3]
Chukwu nwa emere mmadụ, Okwu Chineke abịago
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ
Maka nleta I bịara ileta ụmụ Gị
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ.
Eze nk'ụwa nile I gaachi chi chi gịde
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ.
Okwu nke Chukwu, Okwu enweghị mbido na njedebe
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ.
Ọtito dịrị Nna dịrị Nwa na Mmụọ Nsọ
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ.
Chukwu nwa emere mmadụ, Okwu Chineke abịago
Emmanuel anyị naasị Gị daalụ
Abịago Emmanuel anyị naasị Gị daalụ.