Full Lyrics
[CHORUS]
Ekwem n'otu Chukwu Nna jike nile
Onye ker'eligwe n'ala n'ihe nile nke di n'ime ya.
[VERSE 1]
Ya n'otu onye nweanyi Jesu Kristi so etu nwa Chineke muru
Nna muru tupu uwa tuwa tupu uwa fuwa nile.
[VERSE 2]
Chukwu si na Chukwu Ihe si n'Ihe ezi Chukwu si na ezi Chukwu
Amuru ya n'yemeghi y'eme ya na Nna bu otu ihe.
[VERSE 3]
Onye esi n'aya mee ihedum Onye maka ihianyi bu mmadu
Na mak'ihinzoput'anyi s'isi n'eligwe gbadata.
[VERSE 4]
O were ahu na Virgin Maria site na Muonso oburu mmadu
Abia kpogbuo ya n'obe n'oge Ochichi Pilate.
[VERSE 5]
O tara ahuhu onwugo elie ya m'obilite n'ubochi nke ato
Di k'akwukwo nso siri kwuo ogogoro n'eligwe.
[VERSE 6]
N'oro n'aka nri Nna m'ogabighachi ozo n'ebube
Ya kpe ndi ndu n'ndi nwuru ikpe ny'ochichi ya n'enweghi ube.
[VERSE 7]
Ekwem na Muo Nso onye nweanyi n'enye ndu onye si na Nna na Nwa puta
Nye an'ekpuru n'eto kodo yana Nna na Nwa.
[VERSE 8]
Onye si n'onu ndi amuma kwu okwu Ekwem n'otu nzuko nso Katolik n'Apostolik
Kwuputa m'otu baptism nke mgbaghara njo.
[VERSE 9]
Anam atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu ndu n'uwa anuru
N'ndu uwa ozo gabia nu Amen Amen Amen.