Full Lyrics
Nuria, nuria, Dinwenu anyi ebilitego.
Dinwenu anyi ebilitego.
Jesu emerigo ọnwụ, Jesu emerigo ọnwụ.
Jesu ebiligo... biligo n'ọnwụ,
Biligo n'ọnwụ ka anyị nuria.
Ka anyị nuria, ka anyị nuria, ka anyị nuri bọ,
Maka na Jesu emerigo ọnwụ.
Jesu Kristi bụ onye mmeri.
Ọ kaa omee. Odogwu Jesu.
Onye akpọgburu n'obe Jesu,
Kpubere okpu ogwu Jesu, a pịara ihe.
Ọ biligo, anyị nuria oh...
Nụ nuri ba, nuri ba, nuri ba oh...
Ụwa nile tibe nụ mkpu ọṅụ,
Maka na Jesu Kristi Dinwenu ebiligo.
Ọ bụrụ na Dinwenu anyị ebilighi n'ọnwụ,
Okwukwe anyị gaara bụ ihe efu ohia.
Dinwenu ebiligo. Jesu ebiligo.
Dinwenu ebiligo.
Gosi na m bilite n'ọnwụ dị,
Ụwa mata na Dinwenu anyị bụ odogwu.
Bute bute bute n'ụdụ ka anyị tiere,
Dinwenu anyị rị n'ọnwụ egwu.
Were nụ ịgba, were nụ ogene,
Were n'ọja, were nụ ekwe,
Re ekwe din kwebe nụ ekwe kwebe nụ,
Alleluia. Alleluia.. Alleluia.. Alleluia.. Alleluia.
Alleluia... Alleluia....
Jesu Dinwenu ị bụ dike.
GLORIA
Otito dịrị Chukwu otito.
Otito di okpu, to otito miri emi,
Otito di itunanya, otito ukwu dịrị Chineke,
Kere anyị nye zitere Jesu Kristi nwa ya,
Ka ọ nwụọ maka anyị.
Otito di okpu, otito di okpu.
Otito, tito, otito, otito,
Otito dịrị Jesu Kristi onye nzọpụta,
Nwoke obi ọma anyị nwụrụ n'obe maka anyị.
Otito gaadịrị kwa otito..... otito....
To dịrị kwa Muọ Nsọ onye ndozi,
Onye ndo kwa onye amara.
Otito dịrị a tọ n'otu di ngọzi ebighebi.
Amen. Amen. Amen. Amen. Amen. Amen. Amen.