EJIM OBIM NILE EKELE GI by Stanley Orazi — Lyrics

Stanley Orazi Igbo Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Eji m obim nile, eji m obim nile ekele Gị. Ekele Gị, eji m obim ekele Gị, Anam ekele Gị Chukwu, nara ekele m. Onye nwe anyị, n'ihi n'ị nụla ekpere m o, Onye nwem nara ekele. A gam ekwere Gị ukwe n'ihu ndị mmụọzi, A gam ekwere Gị ukwe n'ihu ndị mmụọzi. A gam akpọ isiala n'ụlọ nsọ Gị, nye Gị ekele, N'ihi aha Gị na nkwa Gị kacha dielu. VERSE 1 Ụbọchị m kpọrọ Gị, ị zata m o, Ị zata m o, ị zata m o. Mekwaa ka ike m bawanye, Mekwaa ka ike m bawanye. Ndị eze nile nọ n'ụwa na ekele Gị, N'ihi na ha anụla banyere nkwa Gị nile, Banyere nkwa Gị nile. VERSE 2 Ha naekwupụta akaọrụ nke Onye nwe anyị na asị: Otito ya dị ukwuu, otito ya dị ukwuu. Onye nwe anyị naesi n'eligwe ele ta ndị umeala, Ndị nganga enwekwaghị ike izonahụ ya, Ndị nganga enwekwaghị ike izonahụ ya. VERSE 3 Ọbụladị na nsogbu gbara m mbikirikiri, Ị naechekwandu m o, setịpụ aka Gị zọpụta m o. Aka nri Gị gaemere m ihe nile, Aka nri Gị gaemere m ihe nile. Onye nwe anyị, ịhụnanya Gị naadị ebebe, Ịhụnanya Gị naadị ebebe. Ahapụkwala anyị ndị ị kere, N'ihi na ịhụnanya Gị naadị ebebe, Naadị ebebe.

Download the sheet music

EJIM OBIM NILE EKELE GI

EJIM OBIM NILE EKELE GI

By Stanley Orazi
Solfa
Igbo
1 page
5 Downloads
Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want