CHINEKE MMA-MMA by Chidi Zeigwe — Lyrics

Chidi Zeigwe Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Chineke mma mma, ekele Chineke mma mma Nara ekele ụmụ gị, Chineke mma mma, ekele Nara ekele ụmụ gị o, Chineke nara o, ekele Nara ekele ụmụ gị jiri bịa be gị Chukwu. [VERSE 1] Anyị nọ n'obi gị Chineke lee Ih'onyinye nke anyị jiri bịa Chukwu Nara ya biko Chineke ma gọzie Nara ekele ụmụ gị jiri bịa be gị Chukwu. [VERSE 2] Ị dịrị anyị mma Chineke ekele Ọpụpụ na mbata anyị dị gị n'aka Onye nche nke Israel dur'anyị gaba Nara ekele ụmụ gị jiri bịa be gị Chukwu. [VERSE 3] Ih'onyinye mara mma k'anyị jiri bịa Ih'onyinye buru ibu k'anyị jiri bịa Anyị jikwa egwu si mma eje n'altar Chineke Nara ekele ụmụ gị jiri bịa be gị Chukwu. [VERSE 4] Ntụgharịa n'aka nri m Chim nọ m nso Ntụgharịa n'aka ekpe Chim nọ m nso Ihu na azụ m Chineke nọkwa ya Nara ekele ụmụ gị jiri bịa be gị Chukwu.

Download the sheet music

CHINEKE MMA-MMA

CHINEKE MMA-MMA

By Chidi Zeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want