Full Lyrics
REFRAIN
O Nna doo, nara ekele m o
O Nna doo, nara ekele m o
Ezi Chineke Nna onye ebere nara ekele m o, Chim lee
VERSE 1
Obolo cha k'obul'edo Chi mara obi m o
Chukwu onye ebere gwa m ihe m g'enye gị Chim obulobacha
Zamu m o zamu m o, zamu m o zamu m o
O di mma n'eme mma
Kporo gị alleluia! Alleluia doo Chim obulobacha
VERSE 2
Onye obi ọma si n'eligwe bịa nara ekele m o, odogwu
VERSE 3
Ụtụtụ ọma ehihie ọma anyasị ọma k'ị n'enyagodi gị onye yiri gị Nna
Ka m g'eji kele gị? Kedu ihe m g'eji kele gị?
Ihe nke m g'enye gị gwa m k'obul'edo
VERSE 5
Ọ bụ ji nke nkwụbụ agbụ, k'ọ bụ mmanya g'eju gị afọ
VERSE 6
Si iyi nke ndụ m o bịa nara m onyinye m e
VERSE 7
Ihe m n'ekuchi m ọma, gwa m ezi ihe m g'enye gị
VERSE 8
Arụsị a gaghị eri ihe m nwere zọ, sọ Chim ị ka m g'enye ya
VERSE 9
Were m o were m Nna, jide m Nna
Para m Nna, kuru m Nna
Jide m o jide m o, eji Nna jisie m ike
Enye m gị onwe m o Chim lee