Sequence of the Mass of Pentecost by PPO Egbo — Lyrics

PPO Egbo Igbo Pentecost Hymns Sequence hymns Gospel Acclamation / Alleluia Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[SEQUENCE] Bia, bia Muo nso, Osebuluwa nk'isi n'eligwe zidata ife Gi, ife Gi n'amuke amuke. [SOPRANO] Bia O Nna ndi ogbenye, wel' onyinye nke ntasi obi bia, bia Onye bi ife ndi nine di ndu. [TENOR] Ngi Onyentasi obi ka si mma, Ngi b'Onye bia n'eny' anuri n'obi, nyenwo ndu. [BASS] N'olu bu ezumike, n'ekpomoku Ngi bu ndo na nsogbu, Ngi bu ntasi obi. [SOPRANO & ALTO] Ife di anwuanwu, Ife Mmuo di ngozi, chajuo n'ime obi ndi nine kwelunu. [FULL CHOIR] I wepu Gratia Gi, onweroz' ife di n'ime mmadu diziocha, ife oma di n'ime ya apua. O bunluzia ife ludalu. [BASS] Biko sachapu atutu njo anyi, gbasammiri n'obi kporo nku, gwoo onya anyi ga. [TENOR] Tinye ume ani n'obi sili ike, munye oku n'obi julu oyi, duzie ndi n'eme njefie uzo. [SOPRANO & ALTO] Nye ndi kwelunu ndi chetosubelu na Gi, ndi n'efe Gi Onyinye isaa Gi di aso. [FULL CHOIR] N'isi njedebe ny'anyi ngoputa, n'ugwo dili ezi omume, nye anyi anuli ebe ebe. Amen. Alleluia. [ACCLAMATION] Bia Muo nso nojuo n'obi ndi kwerenu, me ha munye n'ime ha, munye n'ime ha Oku nk'ihunanya Gi.

Download the sheet music

Sequence of the Mass of Pentecost

Sequence of the Mass of Pentecost

By PPO Egbo
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Pentecost Hymns Sequence hymns Gospel Acclamation / Alleluia Hymns
0 0

More lyrics you may want