Amugoro Anyi Nwa by Okeke Matthias Kalemba — Lyrics

Okeke Matthias Kalemba Igbo Christmas Anthems Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

Amụụr'anyị otu nwa nwoke Amụụr'anyị otu nwa nwoke Amụụr'anyị otu nwa nwoke na Bethlehem n'im'ụlọ anụ na Bethlehem nke Judea Meri mụrụ ya a g'akpọ ya Immanuel Chukwu nọnyere anyị Ụwa golibe golibe golibe n'ọbụkwa onye nzọpụta Ome mma bụ aha ya Ome ih'ukwu bụ aha ya Ony'ebube bụ aha ya Ony'udo bụ aha ya Werenụ opi unu bia Igba egwu dị mma k'anyị fee Chukwu nwa bia r'ụwa n'ọbụ ọkaka a g'akpọ ya Immanuel Chukwu nọnyere anyị Imma Immanuel Imma Imma Imma Immanuel Imma Imma Imma Immanuel Imma Immanuel Imma Immanuel Chukwu nọnyere anyị Chukwu nọnyere anyị Chukwu nọnyere anyị Chukwu nọnyere anyị Amụgoro anyị nwa otu nwa nwoke a g'akpọ ya Immanuel Chukwu nọnyere anyị n'a g'amụr'anyị onye nzọpụta n'a g'amụrụ anyị onye nzọpụta Jee izute ya n'ụlọ anụ ha ji onyinye ọla ọcha Jee izute ya n'ụlọ anụ Jee izute ya n'ụlọ anụ Jee izute ya n'ụlọ anụ A gam ewer'egwu dị mma Jee hụ nwa ka nwa na Bethlehem nke dị na Judea Je mee gịnị? Jee hụ nwa ka nwa Jee hụ nwa ka nwa nwa si n'igwe bia n'ụwa maka nzọpụta nke mmadụ a g'akpọ ya Immanuel Chukwu nọnyere anyị Egwu ọma egwu ọma egwu ọma egwu ọma egwu ọma Jee zute nwa ka nwa Amụgoro anyị otu nwa amụgoro anyị otu nwa a g'akpọ ya Immanuel Chukwu nọnyere anyị

Download the sheet music

Amugoro Anyi Nwa

Amugoro Anyi Nwa

By Okeke Matthias Kalemba
Staff & Solfa
Igbo
16 pages
3 Downloads
Christmas Anthems Hymns
0 0

More lyrics you may want