Full Lyrics
[REFRAIN]
Amarachukwu ezuworom o, o topuwom n'ikpe ọmụma.
Udo n'ọnụ nk'igwe dị n'obi m o, amara Ya ezuworom.
Amarachukwu ezuworom o, o topuwom n'ikpe ọmụma.
Udo n'ọnụ nk'igwe dị n'obi m o, amara Ya ezuworom.
[VERSE 1]
Abụ kam ji bịa nara ekele n'ọrụ rụ Gị
Na m dị ndụ taa ọbụ site n'amara Gị.
Na m nwe r'ụba ọbụ site n'amara Gị
Ihe ọma ị na eme mara mma, amara ị na enye na edu anyị
Narọ onyinye m o, onyinye si n'obi m o.
[VERSE 2]
Ị zara m o mgbe m kpọrọ Gị Chi m o
Ị mere k'ọnuo chi wa m o nu
Were nku Gị kpuchie m o
Nara onwe anyị aja missa
Ka anyị n'enye Gị onyinye anụrị
Ka anyị n'enye onyinye ngọlị
Ka anyị n'enye
Narọ onyinye m o, onyinye si n'obi m o.
[VERSE 3]
Obi m o na egoli Chi obi ọma
Ị naghị eri ji otito k'ị n'eri
Ebube dike onye kam bụ ị n'eche re m o
Ọnụ m bụrụ sọ ọñụ; o zughị inye Gị ekele
Ahụ m bụrụ sọ ọñụ, o zughị inye Gị otito
Narọ onyinye m o, onyinye si n'obi m o.