Aja Dị Nsọ by Fred V. C. Uche — Lyrics

Fred V. C. Uche Igbo Offertory Hymns Consecration Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Aja dị nsọ Aja dị ok'ọnụ k'ụmụ Chineke n'achụrụ Chukwu Aja anyị n'achụrụ Chukwu bụ onwe anyị Ahụ na mkpụrụ obi anyị Nara, Nna nara, nar'onyiny'ụmụ gị nara aja dị nsọ VERSE 1 Anyị ekele gị mak'ọgọ gị nile Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị Anyị ekele gị maka afọma gị Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị Anyị ekele gị maka ngozi gị Chukwu biko nara aja nara ụmụ gị VERSE 2 Anyị enye gị nsọpụrụ na otito kachasịlụ Anyị edoogị ebube Nna onye kachasịlụ Anyị ebunye gị iko nsọ biko nara ya Anyị edoogị ebube Nna onye kachasịlụ VERSE 3 Anyị arịọ gị mgbaghara njọ anyị Anyị arịọ gị ebere n'obodo anyị Anyị arịọ gị gratia na ngozi nile Anyị arịọ gị ebere n'obodo anyị

Download the sheet music

Aja Dị Nsọ

Aja Dị Nsọ

By Fred V. C. Uche
Solfa
Igbo
1 page
23 Downloads
Offertory Hymns Consecration Hymns
0 0

More lyrics you may want