Full Lyrics
CHORUS
Aja dị nsọ
Aja dị ọkọnụ
K'ụmụ Chineke n'añụrị naebukuru
Aja anyị n'achụrụ Chukwu bụ onwe anyị
Ahụ na mkpụrụ obi anyị
Nara onyinye ụmụ Gị
Nara aja dị nsọ
Nara onyinye ụmụ Gị
Nara aja dị nsọ
VERSE 1
Anyị ekele Gị maka ogo dị nile
Anyị ekele Gị maka afọma Gị
Anyị ekele Gị Nna maka ngozi Gị
REFRAIN
Chukwu biko nara aja
Nara ụmụ Gị gozie
VERSE 2
Anyị enye Gị nsọpụrụ na otito kachaelu
Anyị edoo Gị ebube Nna Onye kachaelu
Anyị ebunye Gị ekele nsọ biko nara ya
VERSE 3
Anyị arịọ Gị mgbaghara njọ anyị
Anyị arịọ Gị ebere n'obodo anyị
Anyị arịọ Gị gratia na ngozi nile