Full Lyrics
Solo Intro (Baritone or MezzoSoprano)
Ọ ahụhụ mmụọ,
Ọ ahụhụ mmụọ.
Chorus
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
Lee nụ ka Jesus Xt si wee bịa n'ụwa
N'ụbọchị ụdị mma, ezi ịhụnanya,
Ọ, n'ụbọchị ụdị mma, ezi ịhụnanya.
Chukwu, ọlụebube Chukwu,
Ma ọ gịnị ka mu ma.
Ọnwụ! Ọnwụ n'elu obe!
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
Kwụa ya ụgwọ?
Ọnwụ! Ọnwụ n'elu obe!
Baritone Solo
Ma ọ gịnị ka Jesus mecha,
Ha ji achọ ya ka ọ nwụọ?
Ka ọ nwụọ ọnwụ ihere n'elu obe.
Ọ bụzịkwa Jesus Xt mere ka ndị ngwụrọ bilie gaba ije.
Ọ bụzịkwa Jesus Xt mere ka ndị kpuru isi hụ ụzọ kpọgọ?
Ọ bụzịkwa Jesus Xt mere ka ndị agụụ n'agụ rijụọ afọ.
Ọ bụzịkwa Jesus Onye nwe m mere ka ndị nwụrụ anwụ kube kwa ume ndụ ọzọ?
Ma ọ gịnị ka m'ụwa jiri kwụa ya ụgwọ?
Chorus
Ọnwụ! Ọnwụ n'elu obe!
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
Baritone Solo
Ọ ha echezọgọ ka ha siri tie Hosanna,
Hosanna, Hosanna.
Hosanna dịrị Nwa Dawid n'ebe kacha elu.
Hosanna, Hosanna, Hosanna dịrị Eze anyị o.
Chorus
Ọnwụ! Ọnwụ n'elu obe!
Mana o kweghịzụ ha etigharịa,
Ọnwụ! Ọnwụ n'elu obe!
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
MezzoSoprano Solo
Ọ ahụhụ mmụọ,
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
Lee nụ anya ka ha si ebo Ya ebubo:
N'edugsi n'ọmabiri, n'esi n'ụtụana hụrụ anyị.
Tụ maka Caesar n'ozighi ezi n'iwu,
N'ọbụ Ya bụ Eze, bụzụkwa nwanịmọ.
Pilati asị na Ya ahụghị ihe O mere dị njọ,
Ka ya dụn Ya ọdụ, ma ha akweghị ekwe.
Ha sị, 'Karapụrụ ha Baraba sị Onye ekperima mmụọ, Onye arụ.'
Pilati wee jụa 'Gịnị ka m gaemezi Jesus?'
Ha asị 'Kpọọ Ya ntu, Kpọọ Ya ntu,
Pịa Ya ụtarị ọ dịghị mma, bùa Ya asọ ọ dịghụ mma.'
Ha kpubere Ya okpu ogwu n'isi.
Xt eburobe Ya, obudighi gaba na Calvari.
Ha wee kpọọ Ya ntu, mana ka mgbu kwa.
Xt anwụ maka m!
Chineke gbaghara nụ ha na ha maghị ihe ha n'eme.
Gbaghara m awao Chineke Nna.
Ọ ahụhụ mmụọ Jesus hụrụ anyị.
Xt si wee bịa n'ụwa.
Reprise
Lee nụ ka Jesus Xt si wee bịa n'ụwa.
Ọ ahụhụ mmụọ.