Full Lyrics
[SOPRANO SOLO]
O afụfụ mmụọ
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[TUTTI]
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
O negodu ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa
Lụba ọlụ dị mma
Ọlụ ịhụnanya
Ọ lụe bube
Ọ lụ Chukwu
Ma ọgịnị k'ụmụwa ji kwụa ya ụgwọ
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[BARITONE SOLO]
Ma ọgịnị ka Jesu melu fa fa jia chọya ka ọnwụ
Ọnwụ ifele n'enu obe
Ụmụ nnem, ụmụ nnem a jụa m o
Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị ngwọlọ wụba yọ njọli?
Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị kpu isị fụba ụzọ k'ụgọ?
Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị a gụụ n'agụ liju afọ?
Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị nwụlu anwụ we kube kwa ume ndụ ọzọ?
Ma ọgịnị k'ụmụwa ji li kwụa ya ụgwọ
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
O fa echezọgo ka fa si tie Hosanna
Hosanna, Hosanna dili nwa David n'ebe kachasị enu
Hosanna, Hosanna, Hosanna dị l'eze anyị o
Mana o kwero izu fa e tigharịa
Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe
[TUTTI]
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[SOPRANO SOLO (WITH OBLIGATO CHORUS)]
O afụfụ mmụọ
O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
Negodu afụfụ ọ na afụ
Ụfọdụ asị n'ọna emealụ
N'ọ sị n'ọ tụana atụ maka Caesar na ọzị r'ezi n'iwu
N'ọbụ Ya bụ Eze
Bụlụ kwan tụ na ịmọ
Pịlatịa sị na ya fụrị f'eome lụ dị njọ
Ka ya dụpụ ya pụdụ
Mana fa e kwero ekwe
Fa asị ọnwụ, ọnwụ...