AFỤFỤ MMỤỌ (da Story of the Cross) by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Lenten Hymns Holy Week Hymns Anthems Solfa notation

Full Lyrics

[SOPRANO SOLO] O afụfụ mmụọ O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị [TUTTI] O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị O negodu ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa Lụba ọlụ dị mma Ọlụ ịhụnanya Ọ lụe bube Ọ lụ Chukwu Ma ọgịnị k'ụmụwa ji kwụa ya ụgwọ Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị [BARITONE SOLO] Ma ọgịnị ka Jesu melu fa fa jia chọya ka ọnwụ Ọnwụ ifele n'enu obe Ụmụ nnem, ụmụ nnem a jụa m o Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị ngwọlọ wụba yọ njọli? Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị kpu isị fụba ụzọ k'ụgọ? Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị a gụụ n'agụ liju afọ? Ọ bụzị kwa Jesu Kristi melu ka ndị nwụlu anwụ we kube kwa ume ndụ ọzọ? Ma ọgịnị k'ụmụwa ji li kwụa ya ụgwọ Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe O fa echezọgo ka fa si tie Hosanna Hosanna, Hosanna dili nwa David n'ebe kachasị enu Hosanna, Hosanna, Hosanna dị l'eze anyị o Mana o kwero izu fa e tigharịa Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe [TUTTI] O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị [SOPRANO SOLO (WITH OBLIGATO CHORUS)] O afụfụ mmụọ O afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị Negodu afụfụ ọ na afụ Ụfọdụ asị n'ọna emealụ N'ọ sị n'ọ tụana atụ maka Caesar na ọzị r'ezi n'iwu N'ọbụ Ya bụ Eze Bụlụ kwan tụ na ịmọ Pịlatịa sị na ya fụrị f'eome lụ dị njọ Ka ya dụpụ ya pụdụ Mana fa e kwero ekwe Fa asị ọnwụ, ọnwụ...

Download the sheet music

AFỤFỤ MMỤỌ (da Story of the Cross)

AFỤFỤ MMỤỌ (da Story of the Cross)

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
3 pages
4 Downloads
Lenten Hymns Holy Week Hymns Anthems
0 0

More lyrics you may want