Full Lyrics
REFRAIN
Zidata muo gi, O Oseburuwa,
mee uwa nke a k'odiohuru.
VERSE 1
Gozie Oseburuwa mkpur'obi mo,
Oseburuwa Chukwu m di nnukwu ebube,
lee ka oru gi siri juputa ebe nile.
Oseburu uwa, uwa nile juputara n'uba gi,
biko zidata.
VERSE 2
O buru n'i werekwa muo gi,
ha nile anwururusia.
O buru n'i werekwa muo gi Chukwu,
ha anile alachigha n'ekum ha si wee puta.
Zidatara muo gi e kee ha,
I wee mee ihu uwa nke a k'odiohuru,
biko zidata.
VERSE 3
K'otito dir' Oseburuwa ebebe,
k'Oseburuwa nwe nnukwu anuri n'oru ya nile,
ka uche m di mma n'ihu ya,
n'Oseburu uwa kam n'enwe anuri m,
biko zidata.