EZE AMULU OHURU by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Christmas Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ihe akuko emeela nu o! Ony'obula gbab'egwu! Uwa nile k'anyi golibenu o, n'amulu Eze uwa nile. Kristi abiago! Amulu Ya n'ulo anu, na Bethlehem, Judea. K'anyi jee nu, k'anyi jee nu kelee Eze uwa nile. Kristi mo, Eze amulu ohuru. Onye nzoput'a biago n'elu uwa. Eze amulu ohuru. VERSE 1 Lee ka enibere Ya n'agbuke. Lee Maria ka o ku nwa ohuru Ya. Okpar'eze nk'udo! Emmanuel! Nna di ebebe, Ony'ukwu! Onye nzoput'anyi. VERSE 2 Kpakpando n'amu ke, n'amu ke n'igwe, kpakpando n'amu ke. O n'egosi uwa ebe ahu amuru Jesu. Ndi nche aturu ji oso na ije gbagaba n'ulo anu, oge ha nulu ozi. Ndi eze ato si n'owuw'anya nwu bia, ha n'acho Ez'uwa. Ha chotara Ya n'ihi na kpakpando n'amu ke. VERSE 3 Ndi Muozi, doo, kwekenen'u kwe ahu unu kwer'ozo! Kwedatanu ebube Chineke n'im'obi ndi mmadu. Kwebenu udiri Chineke n'elu kach'elu. Udo, n'ezie, udo Chineke! Udo diri ndi mmadu, nd'ihe ha na aso Chukwu.

Download the sheet music

EZE AMULU OHURU

EZE AMULU OHURU

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
8 Downloads
Christmas Hymns
0 0

More lyrics you may want