EKERESIMESI ELUTEGO by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Christmas Anthems Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Concert Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ekeresimesi elutego, eh! Ekeresimesi elutego eh! O lutego! K'anyi nuria nu na Kristi, Nwa Chineke abiago. Ekeresimesi elutego eh! O lutego! Jekene nu but'igba n'egwu oma n'ogene nke characha! Kua mgbirigba eh! Kua mgbirigba eh! Doo biko kua mgbirigba eh! Nwa Chineke abiago. Kua mgbirigba eh! Ekeresimesi abiago! Kua mgbirigba eh! Kua mgbirigba eh! Doo biko kua mgbirigba eh! Nwa Chineke abiago. Kua mgbirigba eh! Ekeresimesi elutego! VERSE 1 Jesu Nwa Chineke, amuru Ya n'ul'anu, n'ikpo ahia k'amuru Ya. Meri nne Ya gbobe Y'akwa, wee nibe Ya n'agbuke. VERSE 2 Ndi nche aturu no n'ime ohia n'etiti abali. Ha n'eche aturu ha, aturu ha n'akpara nri. Na ntumade, Nmuozi nke Chukwu biakwutere ha, ebube ya zuru h'ahu! VERSE 3 Nnukwu egwu jidere ha, obi nmapu jide ha. Nmuozi gwara ha si ha, "Unu atul'egwu! N'obodo Devid, taa, amutaal'unu Onye nzoputa, Kristi, Dinwenu!" VERSE 4 Ndi eze ato si n'owuw'anya nwu bia. Ha n'acho Eze amuru ohuru. Kpakpando wee puta n'udi pur'iche wee duruo ha n'ebe nibere Ya.

Download the sheet music

EKERESIMESI ELUTEGO

EKERESIMESI ELUTEGO

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
10 pages
21 Downloads
Christmas Anthems Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Concert Hymns
0 0

More lyrics you may want