Full Lyrics
CHORUS
K'anyi jee na Bethlehem ebe amuru Jesu Kristi
na Bethlehem ebe amuru Nwa ka nwa.
VERSE 1
K'anyi jee na Bethlehem n'Obodo Judea
Ebe amuru Jesu, Nwa ka nwa.
VERSE 2
Otu Nwa k'amuru anyi Eze g'achi uwa nile,
Bianu k'anyi kelenu Nwa ka nwa.
VERSE 3
N'ime ulo anu n'ebe anachinye ahihia
Ka enibere Jesu, Nwa ka nwa.
VERSE 4
Uwa n'enwe anuri, onu di n'eligwe
n'ihi n'amuru Jesu Nwa ka nwa.
VERSE 5
Ndi mu'ozi n'ekwe "Otito diri Chineke
n'elu kasielu, udo dikwa n'uwa ndioma."