A muru Dinwenu N'uwa by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Christmas Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Ndị mmụọma siri n'eluigwe gbadata n'ụwa mgbe a mụrụ Dinwenu. Ha naekwere Ya ukwe dị mma, ha naekwere Ya ukwe naasị: CHORUS Alleluia, Alleluia! Hosanna, Hosanna n'ebe kacha elu dịrị Gị Jesu Kristi. Alleluia, Alleluia! Hosanna, Hosanna n'ebe kacha elu dịrị Nwa Chukwu Jesu Kristi. VERSE 2 Ụwa nile soronụ ndị mmụọma, Soronụ ndị mmụọma, soro ndị mmụọma Kwebere Dinwenu ukwe dị ọhụrụ. Were nnụbọ, ụbọ dị ụtọ, ụbọ na opi, Kwebere Ya ukwe naasị: VERSE 3 Onye nzọpụta anyị Jesu abiago, Onye nzọpụta anyị Kristi abiago. Nke sitere n'ala Bethlehem, Nwebenụ añụrị na Kristi abiago. Jesu abiagonụ n'onwe Ya, Kwebere Ya ukwe naasị: VERSE 4 Otito, otito, otito dịrị Nna, Onye zitere Gị, dịrị Gị Kristi Eze amụrụ ọhụrụ. Otito, otito, otito dịrị Nna, Onye zitere Gị, dịrị Gị, dịkwara Mmụọ Nsọ ebebe. Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

A muru Dinwenu N'uwa

A muru Dinwenu N'uwa

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
3 pages
8 Downloads
Christmas Hymns
1 0

More lyrics you may want