Full Lyrics
INTRO
Lego ụlọ Gị Chineke
Sịma kacham biri n'ụlọ Gị
Nke a obi m g'eju n'añụrị dị okpu
CHORUS
Añụrịrị m o nu mgbe m nụrụ
K'anyị je n'ụlọ Chukwu
O nu mgbe m nụrụ
K'anyị je n'ụlọ Chukwu
O nu mgbe m nụrụ
K'anyị je n'ụlọ Dinwenụ m
Bụ ebe mara m
K'anyị jee n'ụlọ Chukwu
Amara n'udo juru n'obi Ya eh
Ngozi juru n'ụlọ Ya
Were ọñụ fee Chukwu dị ndụ
K'o wusa Gị ngozi n'uju
VERSE 1
Otu ụbọchị n'abe Chukwu
Ka m mma o, ka m mma karịa
Nnukwuru nnu afọ n'ebe ọzọ
Ụlọ Chukwu mara m mma
VERSE 2
Ịkwụ n'ụzọ n'ụlọ Ya
Ka m mma o, ka m mma karịa
Ibinyere ndị ajọ mmadụ
N'ebe obibi ha
VERSE 3
Ụlọ Ya mara m mma
A ga m eje chunyere Ya aja lee
K'ụlọ Ya si amuke
A ga m eje chunyere Ya aja
Aja ị si ọma maka obi ọma Ya
Maka ịhụnanya Ya
Maka ebere Ya
Maka nkwụdosike Ya
Na ọrụ ọma Ya n'ime ndụ m o