Full Lyrics
[CANTOR]
Bịanụ k'anyị tikusie Jehova mkpu ọṅụ,
K'anyị tikusil' oke nkume nke nzọpụta anyị mkpu ọṅụ ike.
[ANTIPHON]
N'ihi na Chineke ukwu ka Jehova bụ,
Ọ bụkwa Eze ukwu n'achị chi niile,
Ọ bụkwa Eze ukwu n'achị chi niile.
[SECTION 2]
K'anyị were ekele bịa n'ihu ya,
K'anyị wer' abụ ọma tie Ya mkpu ọṅụ ike.
[SECTION 3]
Onye nwe ebe niile, ebe dị chasị lu n'ugwu niile bụkwa nke ya,
Nke mịcha sir'emi n'ụwa dị n'aka ya.
[SECTION 4]
Onye nwe ok'osimiri, ya onwe ya mekwara ya,
Ọ bụkwa aka Ya kpuru ala akọrọ.
[SECTION 5]
Batanụ k'anyị kpọọ isiala n'ihu ya,
Kwala gbuo ikpere n'ala n'ihu Jehova Onye mere anyị.
[SECTION 6]
N'ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị,
Anyị onwe anyị bụkwa ndị ọ naachị, atụrụ nke aka Ya.
[VARIATION]
Taa ọ bụrụ n'unu ege ntị olu ya,
Unu emena ka obi unu sie ike.
Ka na Meriba,
Unu emena ka obi unu sie ike.
Mgbe nna unu nwaram n'ọzara taa m ihe,
Unu emena ka obi unu sie ike.