VENITE by D. M. Okongwu — Lyrics

D. M. Okongwu Igbo Anthems Entrance songs Psalms Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CANTOR (BASS)] Bịanụ k'anyị tikusie mkpu nñụ, k'anyị tikusie mkpu nñụ nke nzọpụta, yị mkpu nñụ ike. [ANTIPHON] N'ihi na Chineke ukwu ka Ọ bụ, Ọ bụkwa Eze ukwu na chi chi niile. [DUET SOP/ALTO] K'anyị were ekele bĩa n'ihu Ya, k'anyị wer' abụ ọma tikusie Ya mkpu nñụ ike. [BASS] Onye ke niile nke michasịrị emi n'ụwa dị n'aka Ya; ebe dị chasị elu n'ugwu niile bụkwa nke Ya. [SOPRANO] Onye nwe okosimiri Ọ bụ n'ihi Ya mekwara Ya, Ọ bụ aka Ya kpuru ala akọrọ. [ANTIPHON] Batanụ k'anyị kpasị ala n'anị kwala, k'anyị gbue ikpere n'ala n'ihu Iehova Onye mewor' anyị. [SOPRANO] N'ihi na Iehova bụ Chineke anyị, anyị bụ n'ọha Ya bụkwa igwe atụrụ nke aka Ya. [ANTIPHON (VARIATION)] Ọ bụrụ n'ụnụ ege ntị olu Ya, ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike, ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike, Ọ bụụ nụ sie ike. [BASS SOLO] Dị ka na Meriba, ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike, Ọ bụụ nụ sie ike. [SOP. SOLO] Mgbe nna ụnụ nwara m, nwa nita m ihe m mere nuolu m. [BASS SOLO] Ha we ha amaghịkwa ụzọ m niile, ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike. [FULL CHOIR] Sị, ha gaghị aba n'izu ikem mbọlị. [GLORIA] Otito dịrị Nna, n'Ọkpara na Mmụọ Nsọ, Otito dịrị Nna n'Ọkpara na Mmụọ Nsọ, otu o dịrị na mbụ k'o di ugbu a, Ọ gaadịgide otu a we rue n'ụwa ebighebi. Amen.

Download the sheet music

VENITE

VENITE

By D. M. Okongwu
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Anthems Entrance songs Psalms Hymns
0 0

More lyrics you may want