Full Lyrics
[CANTOR (BASS)]
Bịanụ k'anyị tikusie mkpu nñụ,
k'anyị tikusie mkpu nñụ nke nzọpụta,
yị mkpu nñụ ike.
[ANTIPHON]
N'ihi na Chineke ukwu ka Ọ bụ,
Ọ bụkwa Eze ukwu na chi chi niile.
[DUET SOP/ALTO]
K'anyị were ekele bĩa n'ihu Ya,
k'anyị wer' abụ ọma tikusie Ya mkpu nñụ ike.
[BASS]
Onye ke niile nke michasịrị emi n'ụwa dị n'aka Ya;
ebe dị chasị elu n'ugwu niile bụkwa nke Ya.
[SOPRANO]
Onye nwe okosimiri Ọ bụ n'ihi Ya mekwara Ya,
Ọ bụ aka Ya kpuru ala akọrọ.
[ANTIPHON]
Batanụ k'anyị kpasị ala n'anị kwala,
k'anyị gbue ikpere n'ala n'ihu Iehova Onye mewor' anyị.
[SOPRANO]
N'ihi na Iehova bụ Chineke anyị,
anyị bụ n'ọha Ya bụkwa igwe atụrụ nke aka Ya.
[ANTIPHON (VARIATION)]
Ọ bụrụ n'ụnụ ege ntị olu Ya,
ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike,
ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike,
Ọ bụụ nụ sie ike.
[BASS SOLO]
Dị ka na Meriba,
ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike,
Ọ bụụ nụ sie ike.
[SOP. SOLO]
Mgbe nna ụnụ nwara m, nwa nita m ihe m mere nuolu m.
[BASS SOLO]
Ha we ha amaghịkwa ụzọ m niile,
ụnụ emena ka obi ụnụ sie ike.
[FULL CHOIR]
Sị, ha gaghị aba n'izu ikem mbọlị.
[GLORIA]
Otito dịrị Nna, n'Ọkpara na Mmụọ Nsọ,
Otito dịrị Nna n'Ọkpara na Mmụọ Nsọ,
otu o dịrị na mbụ k'o di ugbu a,
Ọ gaadịgide otu a we rue n'ụwa ebighebi. Amen.