UWA NURIBA, ONY'EZE ABIAGO by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Christmas Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ụwa ṅụrịba n'Eze abịago, Ụwa ṅọrịbẹ n'Eze abịago. Ọ rutego, abịago. VERSE 1 Aịzaya onye amụma kwuru sị Vejin gaatụrụ ime n'ike nke Muọ Nsọ. Nwa ọ gaamụ bụ Nwa ka nwa, Onye gaabịa bụrụ onye nzọpụta. VERSE 2 Vejin Maria tụrụ ime k'onye amụma siri kwu N'ike nke Muọ Nsọ. Ọ mụrụ nwa akpọrọ Imanuel Nke pụtara Chukwu nọnyere anyị. VERSE 3 Ndị nche atụrụ nwetara ozi nwa Ebe ha n'eche atụrụ ha n'etiti abalị. Ha were ọsọ gbaga Bethlehem Were hụ nwa kanwa ka Muọ ozi siri kwu. VERSE 4 Onyinye ọlaedo, frankinsens na mea, Onyinye ndị eze kandịamamihe jiri bịa, Onyinye obi m o, otito n'egwu ọma, Kam n'ebunye Gị biko nara ya.

Download the sheet music

UWA NURIBA, ONY'EZE ABIAGO

UWA NURIBA, ONY'EZE ABIAGO

By Chibi
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Christmas Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want