Full Lyrics
INTRO
Aya ewo, ewo, ewo, aya ewo, ewo
Uwa, uwa, aya o ewo, aya o
CHORUS
Uwa nkaa sefuo o di omimio
Uwa anyi no na ya o di omimio
VERSE 1
Nwoke puta mh! o kpuru uwa n'onu
Nwanyi a puta o bu r'uwa n'isi
Agbogh' aputa agboghachiri uwa n'ukwu
Uwa o onyo bula uwa o nwannem
Uwa anyi no n'ime ya osika
Uwa di egwu
Uwa nkaa sefuo ewo uwa di egwu o
VERSE 2
Ijee n'ihu jee n'azu gini k'iga nu
Uwe sikike, uwe mebiwo, uwa ka njo
Uwa enwe m meta ewo
Ufodu na kpo Chike kex'uwa ko bia ngwa mebi'y uwa okese
O kpoba Chike kex'uwa anyi no k'o bia mebie ya
Ndi enyere ndu h'asi na onwu kara hamma
Chukwu kex'uwa choo yo mma
Kee anulo, kee an'ohia, mecha kee madu mee y'onyisi
Ozugbo wero onodu ya medu'e si n'ibu isi wee chib'onwe y'ohia
Ahuhu ebido nsogbu aputa mmegbu e
Wero nodu ak'oxixi n'ok'onunu ikpobsi n'ikpote juputa ebe nile
VERSE 3
Omadu eji x'ako n'uche Chukwu nyere ya
O wee xubi he nile di chiche ndi di ya mma
Ndi ukwu na ndi nta, ndi oma na ndi dinjo
O kwa ihe onye n'acho k'o n'ahu
Isi kot'ebu o gbaa ya egwu
Site n'ok'ochicho madu ohi naghugho
Exingaxi aba taa anwu echi
Wayo dicheche mmegbu igbu madu n'egho nso
VERSE 4
Nodu x'ala che'echiche banyer'uwa anyi no n'ime ya
I n'aga n'uzo dimma k'o bu n'uzo dinjo enyi mo
Weput'obi cheput'echiche k'anyi dozie uwa Chukwu nyex'anyi
Gbanwe agwa m'ezi okwu k'uwa nyi wee dimma
Chetakwa uwa ma ana e ony'obula y'enw'anuxi
Uwa ma mma e udo g'adi n'uwa nile
REFRAINS
Tughari uche banyer'uwa anyi no n'ime ya
Weput'obi k'anyi dozi'uwa chi kex'anyi dobe
O kwa onye y'ak'ute ya o hie n'alo
Nsogbu di n'uwa tata bu madu hietere ya
Ukpax'okpaxo gburu nti chiri ya
Gbanwe agwa tughari uche k'uwa max'anyi mma
Sopuru nwata ka nsopuru gi nka
Kpa ezi agwa ka ndi ozo muta gi n'aka
Ubochi ata k'anyi chukwax'uwa nyi k'o nyi wee dimma
OUTRO
Uwa ma mma e ony'obula g'enw'anuxi
Udo g'adi n'uwa nile
Ya k'anyi n'ay'onye nwe uwa k'ozoputa anyi
Zoputa anyi Nna biko, biko.