Full Lyrics
CHORUS
Ụwa juputara n'ịhụnanya,
ịhụnanya nke Dinwenu.
VERSE 1
Onyenweanyị naakwado ikpe kwụrụ ọtọ,
Ọrụ ya niile kwesịrị ntụkwasị obi.
Ezi omume na ikwu ọtọ naasọ Dinwenu,
ụwa juputara n'ịhụnanya ya.
VERSE 2
Ọ bụ okwu ọnụ ya ka o jiri kee igwe,
ufulu si n'ọnụ ya ka kpakpando niile jiri dị,
Ọ bụ ya naejikọ mmiri niile,
naechekwa ogbummiri ohummiri.
VERSE 3
Ha dị ngọzi bụ ndị Chineke bụ Chukwu ha,
ndị o họtara ka ha bụrụ ndị nke ya.
Dinwenu si n'igwe naelepụta anya ya,
naahụ ụmụ mmadụ niile.
VERSE 4
Mkpụrụ obi anyị naeche Onyenweanyị,
Ọ bụ ike anyị na onye nchedo anyị.
Onyenweanyị, biko nye anyị ịhụnanya gị,
n'ihi na nchekwube anyị dị na gị.