Uwa Alaba Aghara (world Of Vanities) by Okeke Paschal Okechukwu — Lyrics

Okeke Paschal Okechukwu Igbo Lenten Hymns Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Tururum... Pararam... Tururum... Pararam... VERSE 1 Ekwensu n'agb'okembo k'o duhie'ụmụ Chineke. Ụwa Chukwu kere tinye'anyị na'mbụ ụwa bụrụ sọ mma, Any'ukwu wee jid'ụwa wee tinye ya katakata. CHORUS Chukwu biko ghara, Nna, anyi'emehiego Akụ ụwa, ego ụwa, ihe ụwa Ụtọ ụwa, ije ụwa, elu ụwa Naanị nw'oge nta, Akụ ụwa n'ego ụwa n'ihe ụwa N'ụtọ ụwa, m'ije ụwa n'elu ụwa Bụ alaba aghara. VERSE 2 Oke'ọchịchọ na any'ụfụ n'etis'ụmụ Chineke, Ụwa Chukwu kere tinye'anyị na'mbụ, ụwa ịhụnanya, Any'ụfụ wee jid'ụwa wee kunye ya yagayaga. VERSE 3 Ikw'iko na'njọ'mmetọ ebibiela ụwa chaị! Ụwa Chukwu kere, tinye'anyị na'mbụ, ụwa sama sama sama, Nwa'nkemmadụ wee jid'ụwa wee nyachaa ya potopoto.

Download the sheet music

Uwa Alaba Aghara (world Of Vanities)

Uwa Alaba Aghara (world Of Vanities)

By Okeke Paschal Okechukw...
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
3 Downloads
Lenten Hymns Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want