Full Lyrics
INTRO
Tururum... Pararam... Tururum... Pararam...
VERSE 1
Ekwensu n'agb'okembo k'o duhie'ụmụ Chineke.
Ụwa Chukwu kere tinye'anyị na'mbụ ụwa bụrụ sọ mma,
Any'ukwu wee jid'ụwa wee tinye ya katakata.
CHORUS
Chukwu biko ghara, Nna, anyi'emehiego
Akụ ụwa, ego ụwa, ihe ụwa
Ụtọ ụwa, ije ụwa, elu ụwa
Naanị nw'oge nta,
Akụ ụwa n'ego ụwa n'ihe ụwa
N'ụtọ ụwa, m'ije ụwa n'elu ụwa
Bụ alaba aghara.
VERSE 2
Oke'ọchịchọ na any'ụfụ n'etis'ụmụ Chineke,
Ụwa Chukwu kere tinye'anyị na'mbụ, ụwa ịhụnanya,
Any'ụfụ wee jid'ụwa wee kunye ya yagayaga.
VERSE 3
Ikw'iko na'njọ'mmetọ ebibiela ụwa chaị!
Ụwa Chukwu kere, tinye'anyị na'mbụ, ụwa sama sama sama,
Nwa'nkemmadụ wee jid'ụwa wee nyachaa ya potopoto.