Full Lyrics
REFRAIN
Taa ọ bụrụ na unu anụ olu ya
Unu akpọchila obi unu
VERSE 1
Bịanụ k'anyị kwer' Onyenweanyị ukw'ọma
K'anyị tisie mkpu aṅụrị
Tijeere nkume nke nzọpụta anyị
K'anyị bịa n'ihu ya nye ya ekele
We kporo isiala kwe tobe ya
VERSE 2
Bịanụ k'anyị feo Onyenweanyị kporo ya isiala
K'anyị sekpuo ikpere n'ihu onye kere anyị
N'ihina ọ bụ Chineke anyị
Anyị bụkwa ndị nke ya
Igwe atụrụ ọ naazụ
VERSE 3
Taa ọ bụrụ na unu anụ olu ya
Unu akpọchila obi unu
Dịka unu mere na Masa n'ime ọzara
Mgbe nna nna ha nwara m
Nwalee m, hụ ihe m mere ha
VERSE 4
Afọ iri anọ ka m wesoro ọgbọ a iwe
M wee sị na ha bụ ndị naagbafu n'obi ha
Ndị naamaghị ụzọ m
Ya mere m ji ṅụọ iyi n'iwe m
Sị na ha agaghị abanye n'izuike m