Full Lyrics
CHORUS
Zukọtanụ ụmụ Chukwu k'anyị jee
K'anyị jee n'ụlọ Onyenweanyị
Zukọtanụ k'anyị hee fee Chineke ofufe n'ebensọ Ya
Oge erugo anyị abịawo Nna gọzie anyị.
VERSE 1
Dịka agụụ mmiri sị agụ nne ele
Etu ahụ k'obi m sị achọ Gị Chukwu
Dịka agụụ mmiri sị agụ nne ele
Etu ahụ k'obi m sị achọ Chukwu nke Jacob.
VERSE 2
Aja Missa dị asọ bụ aja ahụ n'ọbara Onyenweanyị
Nke ọ chụrụ n'elu obe
K'anyị n'achụ n'elu Alter.
VERSE 3
Ngwanụ k'anyị jeenụ oge erugonu
REFRAIN
Ngwanụ k'anyị kpọisiala n'ebensọ Ya
Otito niile g'adịrị Chineke.