Full Lyrics
**INTRO**
K'anyị batawa n'ụlọ nsọ
Kpọọ isiala nye Chineke
Onye mara k'osi dịrị m o
Eze m o e Nna m o
**CHORUS**
Bịa k'anyị jee n'obi Chukwu
Kpọọ isiala nye Chineke
Onye n'ememma lee nụ m o
N'obi Gị e Papa
**VERSE 1**
N'ihu Chineke Chukwu
Onye n'ememma onyinye
Mara mma juru n'obi Gị e
Ony'ọma m o a bịala m o
**REFRAIN**
Chukwuọma dị mma bịa lee nụ m o
N'obi Gị e Papa
**VERSE 2**
N'obi Chineke dị nsọ
K'anyị g'achụrụ ya e
Onyinye dị mma k'anyị gaenye ya e
Ịja mma na mbụni e
Bụ Gị nwe ya lu o
**VERSE 3**
Chukwu ker'ụwa anyị gbịala k'anyị fee nụ
Gị e isiala m o ikpere ala m o
Ihe nwere ọma e Chukwu
Olisa odogwu odogwu m e
Bụ sọ nna