Full Lyrics
INTRO
Aye Ife g'adimma eh
Aye Ife g'adimma eh
S'adir'anyi mma m'udo bata ma
Aye Ife g'adimma eh
CHORUS
Ewo m'udo chiba, m'udo chiba, m'udo chiba
Ewo m'udo chiba, m'udo chiba, m'udo chiba
VERSE 1
N'obodo anyi o, anyi chor'udo ewo
N'obodo anyi e udo k'anyi na cho
Maka n'udo di oga niru a bata
Udo di ihunanya, udo di ndu adi
Umu Igbo nuru nu Udo kam ma
VERSE 2
Geenu nti nuru akuko maka ihe mere n'obodo
Ala oma Obodo Chineke goziri agozi
Ma lezia nu ekworo n'any'ukwu n'etaji anya e
E mee l'anyi a rue mana Eze ha bu Eze udo
O bu Eze udo Oge nile
Kata, kata, kata, kata
Kpe ka na ekpe n'obi Igwe Udo kam ma
VERSE 3
Ndi nazo ala bia akpebe nke ha
Kpesia di na nwunye a bia
Maka eze mokwu ka a n'eme nwanyi a ja du ebere bia
Okuko mo na nio tui hem nwere ya ka nara muo
Nwanyi a ja du ebe be, be be bebe, be be oh
Igwe gwara ya si o ga di nma e udo kam ma
VERSE 4
Igwe tie O bu gini n'eme n'obodo me ewo!
Ife nke a kari go
O kporo Ndi chie ha ni lewe kwekori ta na ha ga enwe nzuko
Ka ha dozie Obodo ha
Koko kom Koko kom e kwe a kuo
Koko kom Koko kom Igwe na kpobodo nile na nzuko ahu
Igwe gwara ha si a bum Eze udo
Udo ga chi n'obodo mu
K'anyi biri nu n'udo K'ife wee diri anyi mma
A chon'ibe gi okwu Onye biri be ya e biri o
A zon'ihe ibe gi o
K'anyi huny'onw'anyi n'anya
Unya nygo Udo kam ma
SPOKEN PART
ICHIE: Alaoma kwenu (Ugboro abuo)
NDI OBODO: Yaa!
ICHIE: Kwezuonu!
NDI OBODO: Yoo!
ICHIE: Anyi anugo okwu Igwe. Ebe Chukwu ji otutu ihe di mma wee gozie Obodo anyi, ka anyi jikozianu aka onu, k'anyi biri n'udo k'ife wee diri anyi mma. Anyi kwekwa ra nke a e?
NDI OBODO: Eyooo!
OTU ONYE ICHIE: Udooo!
ONYE OBULA: Udo gaadi o!
CANTOR & REFRAIN
Cantor: Kata, kata, kata, kata dighi mma n'uwa k'anyi biri nu n'udo
Refrain: Udo chibanyio Ife g'adiri anyi mma. Udo chibanyio Ife g'adiri anyi mma.
Cantor: Siri, siri, siri, siri a dighi mma n'uwa k'anyi kwu puta udo
Cantor: Ihe ruru onye diri ya a cho n'ibe gi okwu
Cantor: Achu n'ife uwa n'ike maka na nwayo, nwayo bu ije o