Full Lyrics
[REFRAIN]
Uche Gị, Nna, g'eme n'ime ndụ
Mgbe nile, ọ n'asọ m o!
Uche Gị, Chineke, emego na ndụ m o.
Kụziere m ị m'uche Gị, Nna
Olee ih'ị ji hụ m n'anya, Chukwu?
Ihe m ji a kwụ Gị ụgwọ?
Ngọzi Gị n'eju m anya. Eh!
Amara Gị n'ebu m aka!...
[A CAPELLA]
K'anyị jee, k'anyị jee,
K'anyị jee n'altar nke Chineke.
K'anyị buru egwu mara mma.
Tibere m onyinye, bata n'altar nke Chukwu,
Anyị g'eburu onyinye mara mma, bịa n'iru Chukwu.
Ọ bụ Gị, nye Gị ekele.
Bur'onyinye k'anyị jee n'altar nke Chineke.
K'anyị buru egwu mara mma.
Tibere m onyinye, bata n'altar nke Chukwu,
K'anyị tobe Chukwu, maka afọma Gị n'ime ndụ m o,
Eh! N'ime ndụ m o, afọma Gị enwegh'atụtụ.
Jaa Gị mma, Chim o!
Mak'ebere Gị.
[VERSE 1]
Kristi tar'ahụhụ n'el'ụwa, eb'ọ n'eme uche Gị, Nna.
Kristi tar'ahụhụ n'el'ụwa, eb'ọ n'eme uche Gị.
Ha mara Y'ụra, ha gburu Ya asọ, ha pịarusiri Y'ahụ, eh!
Kristi nwụr'ọnwụ n'elu obe, eb'ọ n'eme uche Gị.
Chineke Nna, k'otito dịr'aha Gị, k'ọchịchị Gị bịa, ka emee, uche Gị.
[VERSE 2]
Kụzier'anyị, ezi Chineke, ịhụt'uche Gị n'ihe nile,
Kụzier'anyị, ezi Chineke, ịhụt'uche Gị na ndụ anyị.
Ọ bụ n'oriri, ọ bụ n'ọnụnụ, ọ bụ n'ir'uju, ọ bụ n'an̄ụrị,
Ezi Chineke, ka en'uche Gị na ndụ anyị.
Chineke Nna, k'otito dịr'aha Gị, k'ọchịchị Gị bịa, ka emee, uche Gị.
[VERSE 3]
Kụzier'anyị obi nwayọ, na ịnabata ihe nile.
Kụzier'anyị obi ndidi n'ịnabata ihe nile.
Kụzier'any'iwere ntachi obi n'anabata uche Gị.
Kụzier'anyị iwere ọnụ n'anabata uche Gị.
Chineke Nna, k'otito dịr'aha Gị, k'ọchịchị Gị bịa, ka emee, uche Gị.