Full Lyrics
[REFRAIN]
Onyenwaanyi meere nu k'im'uche Gị bụrụ nri m
Ka agụụ ị m'uche Gị chụwe m ụra
Ka m'uche Gị nyewe m afọjuju.
[VERSE 1]
Ngọzi dị elu n'agba n'okirikiri n'ezie
Amara zuru oke n'awa k'iyi
na ndụ ha bụ ndị n'anabata uche Chineke.
[VERSE 2]
Jesu, Virgin Maria na ndị nsọ nile
ndị mer'uche Nna ha hụjuru anya
mana ha nọzi n'otitugbu a
Nna mee ka anyị si n'ahụhụ mezu'che Gị wee
keta añụrị, añụrị Gị dị ebighebi.
[VERSE 3]
Uche Chukwu, uche Chukwu,
Ka ndị mmụọ ọma mer'uche Gị
O! Chineke
na ndị nsọ mer'uche Gị
nọrọba anyị okirikiri
mgbe ebiri nke ụwa ji atụ anyị.
[VERSE 4]
Jesu,
Onye nri Ya bụ m'uche Nna
rịọta r'anyị ngọzi ime
na ịnabata uche Nna
ka n'ahụhụ ka n'añụrị.