TOBECHUKWU (IN GRATITUDE TO GOD) by Azuine-Uche Bruno, Irenaeus Ebinedia — Lyrics

Azuine-Uche Bruno, Irenaeus Ebinedia Igbo Entrance songs Offertory Hymns Celebrations Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO K'ed'ihem g'emere Chineke Nna Onyenwem K'ed'ihem g'eji kele Ya Chukwu ọma? Onyinye n'abụọ otito kam ji bia n'iru Gị eh CHORUS I nye Gị ekele maka ihe ọma n'emere muo Mkpụrụ obi muo tobe Dinwenu o tobe Dinwenum oge nile kwupụta ebube Ya Tobe Chineke Gị n'ọna emere m'ihe ọma VERSE ONE Kwere Dinwenu ukw'ọhụrụ gozie Aha Ya Chineke n'agọzi muo Ọ na emere m'ihe ọma ihe ọma Chineke n'emere muo REFRAIN Ọnụ m'apụghị kọchasi Nare ekelem jiri bia nara n'abụọ otito doo Chukwu ọma ker'ụwa daalụ gọzi' onyinye m buru bia I mere nk'ọma n'ihi n'emere muo ya kam jiri bia n'iru Gị Nna I nye Gị ekele VERSE TWO Chineke n'echekwaba muo Chukwu n'edu muo n'ọpụpụ n'mbata muo so Chineke n'echekwaba muo VERSE THREE Chineke n'azam ekpere Chukwu n'emere m'ihe ọma Onyinye n'ilem si n'aka Chukwu Ya kam ji enye Y'ekele VERSE FOUR Chineke n'azọpụta muo Ọ na elekọta muo n'ọnya nile nke ndị'rom so Chineke n'azọpụta muo

Download the sheet music

TOBECHUKWU (IN GRATITUDE TO GOD)

TOBECHUKWU (IN GRATITUDE TO GOD)

By Azuine-Uche Bruno, Ire...
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
2 Downloads
Entrance songs Offertory Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want