Full Lyrics
INTRO
K'ed'ihem g'emere Chineke Nna Onyenwem
K'ed'ihem g'eji kele Ya Chukwu ọma?
Onyinye n'abụọ otito kam ji bia n'iru Gị eh
CHORUS
I nye Gị ekele maka ihe ọma n'emere muo
Mkpụrụ obi muo tobe Dinwenu o
tobe Dinwenum oge nile kwupụta ebube Ya
Tobe Chineke Gị n'ọna emere m'ihe ọma
VERSE ONE
Kwere Dinwenu ukw'ọhụrụ gozie Aha Ya
Chineke n'agọzi muo
Ọ na emere m'ihe ọma
ihe ọma Chineke n'emere muo
REFRAIN
Ọnụ m'apụghị kọchasi
Nare ekelem jiri bia
nara n'abụọ otito doo
Chukwu ọma ker'ụwa daalụ
gọzi' onyinye m buru bia
I mere nk'ọma n'ihi n'emere muo
ya kam jiri bia n'iru Gị Nna I nye Gị ekele
VERSE TWO
Chineke n'echekwaba muo
Chukwu n'edu muo
n'ọpụpụ n'mbata muo
so Chineke n'echekwaba muo
VERSE THREE
Chineke n'azam ekpere
Chukwu n'emere m'ihe ọma
Onyinye n'ilem si n'aka Chukwu
Ya kam ji enye Y'ekele
VERSE FOUR
Chineke n'azọpụta muo
Ọ na elekọta muo
n'ọnya nile nke ndị'rom
so Chineke n'azọpụta muo