Tiwaa Obi Anyi Chukwu by Emma Ewenike — Lyrics

Emma Ewenike Igbo Lenten Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[TIWAA OBI ANYI CHUKWU] CHORUS Tiwaa obi anyi Chukwu Gbarie obi anyi Chukwu Ala eze gi n'agu anyi aguu Mana obi anyi esi ka VERSE 1 Garu kene n'ogbo ahia Ekpere a naada Abu a naada I chee n'obu ndi muozi Mgbe ha kpesiri ekpere O ruo n'ichu ego uwa Ha chefuo ekpere ha Mebekwa ka ha si eme bu ekpere VERSE 2 I bata ruo n'ulo nso A naada abu a naada I chee n'obu ndi muozi Ma ndi n'enye ibe ha nsi Ma ndi onuobara Ha ncha juru n'ulo nso Ebe ha so n'ekpere Mgbe ha kpesiri ekpere Ha chefuo Chineke Onyeobula yir' aworo ya VERSE 3 I bata ruo n'ulo nso Otu di iche iche juru ya Mana ha naakpa iche iche Ony'obula m'onyotu ya soso O bukwa ndi bu motu Chukwu O bukwa ndi n'acho ije Eligwe Ma ihunanya adighi n'ime ha Tiwaa obi anyi Chukwu [CHUKWU BIKO EWEZINA IWE] CHORUS Chukwu biko ewezina iwe Nna gbaghara m'o Chukwu ewezina iwe Nna gbaghara m'o Chukwu bik' achupuna m'o N'alaeze gi Chukwu Chukwu achupuna m'o N'alaeze gi Chukwu VERSE 1 Emehiela m megide Chineke onye kacha afoma; Onye ebere, Onye ebere, lezie m anya Chukwu. VERSE 2 Onye kere uwa imatago, n'aru anyi esighi ike; Ma site n'ebere gi Nna, anyi naario gi Chukwu.

Download the sheet music

Tiwaa Obi Anyi Chukwu

Tiwaa Obi Anyi Chukwu

By Emma Ewenike
Solfa
Igbo
2 pages
17 Downloads
Lenten Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want