TIWAA OBI ANYI CHUKWU by Emma Emenike — Lyrics

Emma Emenike Igbo Lenten Hymns Prayer Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Tiwaa nu obi anyi Chukwu, gbarie obi anyi Chukwu, ala eze Gi n'agu anyi aguu mana obi anyi esika. VERSE 1 Garukene n'ogbo ahia, ekpere a na'da, abu a na'da, i chee n'obu ndi Muozi. Mgbe ha kpesiri ekpere, o ruo n'ichu ego uwa, ha chefuo ekpere ha, mebekwa ka ha si emebu. VERSE 2 I bataruo n'ulo nso ekpere a na'da abu a na'da i chee n'obu ndi Muozi; ma ndi n'enye ibe ha nsi ma ndi onu obara ha ncha juru n'ulo nso ebe ha so n'ekpere; mgbe ha kpesiri ekpere ha echefuo Chineke onye obuna eyili awulo ya. VERSE 3 I bataruo n'ulo nso otu d'iche iche juru ya ma na ha n'akpa iche iche onye obuna ma onye otu ya so so O bukwa ndi b'umu otu Chukwu O bukwa ndi n'acho ije Eluigwe ma ifunanya adighi n'ime ha, tiwa obi anyi Chukwu. VERSE 4 Ufodu bia n'ihu ndi mmadu, ha n'egosi na ha di nso, ma na obi ha bu okwute tiwakene obi anyi Chukwu. VERSE 5 Lekene nu ndi n'ezu ori ha ncha huru onwe ha n'anya; lekene nu ndi otu nzuzo, ha huru onwe ha n'anya. Ma lekene ndi otu Kristi ihunanya koro ha, ekworo akpomaasi, anya oku na izo isi tiwaa obi anyi Chukwu. VERSE 6 Ufodu si na ha di ocha na h'anaghi emezi mmehie ha guo ekpere onye onu tu na onye Farisii.

Download the sheet music

TIWAA OBI ANYI CHUKWU

TIWAA OBI ANYI CHUKWU

By Emma Emenike
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
4 Downloads
Lenten Hymns Prayer Hymns
2 0

More lyrics you may want