Full Lyrics
CHORUS
Tiwaa nụ obi anyị Chukwu,
Gharie obi anyị Chukwu,
Ala eze gị naagụ anyị agụụ,
Mana obi anyị esika.
VERSE 1
Garu kene n'ọgbọ ahịa,
Ekpere anaada, abụ anaada,
I chee n'ọ bụ ndị mmụọ ozi.
Mgbe ha kpesịrị ekpere,
O ruo n'ịche ego ha chefuo ekpere ha,
Mebekwa ka ndị si emebu.
VERSE 2
Ị bataruo n'ụlọ nsọ,
Ekpere anaada, abụ anaada,
I chee n'ọ bụ ndị mmụọ ozi.
Ma ndị naenye ihe ha nsọ,
Ma ndị aṅụgbara,
Ha ncha juru n'ụlọ nsọ ebe ha so n'ekpere.
Mgbe ha kpesịrị ekpere,
Ha chefuo Chineke,
Onye ọbụla yiri awọrọ ya.
VERSE 3
Ị bataruo n'ụlọ nsọ,
Otu dị iche iche juru ya,
Ndị naakpọ iche iche.
Onye ọbụla ma onye otu ya sọsọ.
Ọ bụkwa ndị bụ ụmụ otu Chukwu,
Ọ bụkwa ndị naachọ ije eluigwe,
Ma ịhụnanya adịghị n'ime ha.
Tiwaa obi anyị Chukwu.