Full Lyrics
[SOPRANO SOLO]
Ihe liile m nwere bu l'aka Chi k'o si bia
Ihe sib'ike Chim l'enyere m'aka
So Chi ma mkpa m aja me buru onyinye maramma
Bia nyey'ekele makala so Chi m'obi mo.
[CHORUS]
So Chi m'obi m o nweghi ihe m l'acho
Ebe Chukwu ma obi m o nweghi ihe koro m
O l'enye m'ochicho obim aja m'ekele ya
Buru ngwa egwu maramma bugara onye ma k'osiri diri mo.
[VERSE 1]
Oburu la chukwu echeghi obodo l'efu ka ndi nche l'eche
Obu ya ji ji jide mma onye o wanyer'o rie
Oma siri Chineke l'o ga diri m'etu a o
Kosiso Chukwu ka o siaso m
Gini ja eme ka m soo ngongo n'ikele onye l'eme m'obi rikpo?
Chim otito gi ja adigide n'egbugber'onum.
[VERSE 2]
Mgbem che l'uwa m'agwula o hicharam anya mmiri
N'etiti ndi irom mkpur'obim kele Chukwu
Laali ya ma echiche obi m
Echiche ya maka m bun k'udo la oga l'ihu.
[VERSE 3]
Onye kam bu l'uwa la Chukwu l'echere mo
Ihe nne mapughi' mere mo okwa ya k'imere mo
Ihe nna mapughi' nyenu mo okwa ya k'inyere mo
Onu ochi ejula m'onu So Chi m'obi mo.
[TENOR AND BASS SOLO]
Ekele, ekele diri Chineke eligwe
Onye mere kam dindu taa eh so Chi m'obi mo
Onye l'enyem mgb'okoro mo onye l'enye m l'a kwughi ugwo
Onye l'ebuli isi m'elu okpum apuo m l'isi
Agbakwuru ezurike, di nwaanyi isim kpe oguguo m'obi mo.
[SOPRANO AND ALTO SOLO]
Nar'otito so Gi bu Chi nar'ojijamma
Chinwendu mo so Gi m'obi mo
Ogologo ndum liile aja mekele Gi
Makala Gi bu enyemaaka m so Gi m'obi mo
So Chi m'obi mo so ya m'obi mo
So Chi so Chi ma eh so Chi m'obi mo
Onu ochi ejula m'onu So Chi m'obi mo
Onu ochi ejula m'onu So Chi mara obi mo, Chi ma obi mo.