Full Lyrics
REFRAIN
Sọ ngị bụ onye m nwere Chineke Nna,
Lezie Nwa gị anya Chukwu,
M'ekwela k'ụwa merie m o.
VERSE 1
A bụ m onye mehie nke dara nka n'olu,
Were Mmụọ Nsọ gị kpalite obi m o.
VERSE 2
Cheta na oyi ọmụma nk'ụwa n'amalite,
Chukwu m oriri ọnwụ na ekwensu bịa.
VERSE 3
Chetakwa n'ebili mmiri n'ụwa ka n'etili li,
Chukwu dajụrụ ebili mmiri o bịa.
VERSE 4
Anyị nọ n'agha n'elu'wa Chineke,
Chukwu m'ekwela k'ụwa merie m o.
VERSE 5
A bụ m Nwa gị Chineke chebe m o,
Biko ekwela k'ụwa merie m o.
VERSE 6
Sọ ngị bụ Chukwu okike Ndụ m dị gị n'aka,
Ị gbarapụ m o ọ gịnị ka m g'eme?