Full Lyrics
REFRAIN
So Ngi bu Onye m nwere Chineke Nna Lezie Nwa Gi anya
Chukwu m e kwela K'uwa merie m'o.
VERSE 1
Abum onye mmehie nke dara mba n'olu
Were Mmuo Nso Gi kpalite obi m'o.
VERSE 2
Cheta na o bu n'nma nk'uwa n'amalili
Chukwu merie m'o na ekwensu bia.
VERSE 3
Cheta kwa n'ebili mmiri nk'uwa ka ntilili
Chukwu daja ebili mmiri o bia.
VERSE 4
Anyi no n'agha n'eluwa Chineke.
Chukwu m e'kwela K'uwa merie m'o.
VERSE 5
Abum Nwa Gi, Chineke, chebe m'o
bik'e'kwela K'uwa merie m'o.
VERSE 6
So Ngi bu Chukwu n'ike, Ndu m di Gi n'aka
I gbarupu m'o O gini ka m geme?