Full Lyrics
AFUFU MMUO
SOPRANO SOLO
O afufu mmuo
Afufu mmuo Jesu talu anyi
TUTTI
O afufu mmuo
Afufu mmuo Jesu talu anyi
Negodu ka Jesu Kristi si we bia n'uwa
Luba olu di nma
O lu ifu n'anya
O lu Chukwu, O lue bube
Chukwu Ma O gini k'um'uwa ji kwua ya ugwo
Onwu n'enu obe
Afufu mmuo Jesu talu anyi
BARITONE SOLO
Ma o gini ka Jesu melu fa fa jia choya ka onwua
Ka onwua onwu ifele n'enu obe
Mu nnem mu nnem a jua mo
O buzikwa Jesu Kristi melu ko ndi ngwolo wuba ujo njo h?
O buzikwo Jesu Kristi melu ka ndi kpulu isi fuba uzo k'ugo?
O buzikwo Jesu Kristi melu ka ndi aguu n'agu li jua afo?
O buzikwo Jesu Kristi melu ka ndi nwuluanwu, we kube kwa ume ndu ozo?
Ma o gini k'um'uwa ji kwua ya ugwo?
CHORUS
Onwu Onwu n'enu obe
Onwu n'enu obe
Afufu mmuo Jesu talu anyi
BARITONE SOLO CONTD
Fa echezogo ka fa si tie Hossana
Hossana Hossana Hossana dili nwa David n'ebe
Kasi enu
Hossana Hossana Hossana dili eze anyi o
Mana okwero izu fa etigha ha
CHORUS
Onwu Onwu n'enu obe
Afufu mmuo Jesu talu anyi
SOP SOLO (WITH OBLIGATO CHORUS)
O afufu mmuo
Afufu mmuo Jesu talu anyi
N'egodu anya ka fa si bo ya ebubo
Ufodu ari n'ona eme alu
N'osi na utu ana atu ma ka Caesar
Na ozi roelzi n'iwu n'obu Ya bu eze
Bulukwanta nai mo
Pilat asi na ya furo ife omelu di njo ka ya
Dua ya odu mana fa ekwero ekwe fa asi
AGA M EKULI
CHORUS
Aga m ekuli lachagha kwuru Nnam
Nna biko, emehielam gi
Megide elu megidekwa gi
VERSE 2
E tosi ghim ka a kpo kwa m nwa Gi
Anam ario gi, gunye m n'umu odibo gi
VERSE 3
E meghim ihe kwesiri na m g'eme
Ihe i si mu emena ka m mere
VERSE 4
Ama m njo m nke oma ihe di njo n'ihu gi