So Otu Ihe Ka M Na-Ario by Izu Marcel Onyeocha — Lyrics

Izu Marcel Onyeocha Igbo Responsorial Psalms Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Sọ otu ihe ka m naarịọ n'aka Dinwenu Ka m biri, ka m biri n'ụlọ nke Dinwenu Na mbọsị ndụ m niile. VERSE 1 Dinwenu bụ ihe na nzọpụta m Onye ka m g'atụ egwu? Dinwenu bụ ebe mgbaba m Onye g'eyi m egwu? VERSE 2 Ọ g'ezobe m n'ebe obibi Ya Na mbọsị ọgbaghara Ọ g'ezobe m n'ime mkpụkpụ Ya Kụbasie m ike na nkume bụ Dinwenu. VERSE 3 A ga m ewere obi añụrị Naachụ aja n'ụlọ Dinwenu A ga m ekwe ukwe añụrị nye Dinwenu. VERSE 4 Otito dịrị Nna na Nwa na Muọ Nsọ N'ụwa t'ụwa niile.

Download the sheet music

So Otu Ihe Ka M Na-Ario

So Otu Ihe Ka M Na-Ario

By Izu Marcel Onyeocha
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Responsorial Psalms Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want