Full Lyrics
REFRAIN
Sọ otu ihe ka m naarịọ n'aka Dinwenu
Ka m biri, ka m biri n'ụlọ nke Dinwenu
Na mbọsị ndụ m niile.
VERSE 1
Dinwenu bụ ihe na nzọpụta m
Onye ka m g'atụ egwu?
Dinwenu bụ ebe mgbaba m
Onye g'eyi m egwu?
VERSE 2
Ọ g'ezobe m n'ebe obibi Ya
Na mbọsị ọgbaghara
Ọ g'ezobe m n'ime mkpụkpụ Ya
Kụbasie m ike na nkume bụ Dinwenu.
VERSE 3
A ga m ewere obi añụrị
Naachụ aja n'ụlọ Dinwenu
A ga m ekwe ukwe añụrị nye Dinwenu.
VERSE 4
Otito dịrị Nna na Nwa na Muọ Nsọ
N'ụwa t'ụwa niile.