Ukwe Onyinye Maka Onye Nwuru Anwu by E. Umuobieri — Lyrics

E. Umuobieri Igbo Burial / Funeral Hymns Offertory Hymns Solfa notation

Full Lyrics

Nara nara nara aja biko Chukwu, aja anyị n'ehunyere Gị maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. K'aja nke a anyị ji akwụgwọ mmehie meda a Gị obi maka njọ anyị. O Dinwenu, anyị n'arịọ ka i were ebere nekwasị anya n'onyiny'anyị n'e bunye Gị mak'ezumike na nzọpụta nw'odibo Gị. Nye ya ọnọdụ ebebe n'etiti ndị nke Gị azọpụtagoro. Nụrụ arịrịọ anyị O, naran'onyiny'anyị O Chukwu. Ka i meere mkpụrụobi nw'odibo Gị ebere k'anyị ji achụnyere Gị aj'otito nke a, nara ya. Gọzie maka ntọrapụ nw'odibo Gị. Anyị ji obi ume ala arịọ ebube eze Gị, ka I nye ya ezumik'ebebe site n'aja nke a anyị ji akwụ ụgwọ mmehie, meda a Gị obi maka njọ anyị.

Download the sheet music

Ukwe Onyinye Maka Onye Nwuru Anwu

Ukwe Onyinye Maka Onye Nwuru Anwu

By E. Umuobieri
Solfa
Igbo
3 pages
8 Downloads
Burial / Funeral Hymns Offertory Hymns
0 0

More lyrics you may want