Full Lyrics
CHORUS
Jesu chekwaba mkpụrụ obi m o,
Jesu chekwaba mkpụrụ obi m n'udo o n'udo,
Ị gaghị ekwe k'obi m o ree ure n'ala ndị mmuo.
VERSE 1
Mkpụrụ obi m kere n'oyiyi gị,
Jesu mkpụrụ obi m kere n'ụdị a nwụghị anwụ,
Lee m k'o togbọrọ,
Lee m k'o togbọrọ,
Jesu ọ gaghị ere n'ili ọnwụ,
Ọ gaghị ere n'ili ọnwụ.
VERSE 2
Chukwu erughị nwe ya k'o ree ure n'ili,
Chukwu erughị nwe ya k'o ree ure n'ili,
Chukwu merie ọnwụ,
Chukwu merie ọnwụ,
Merie mmehie chekwaba obi m o n'ebe nsọ gị.
BASS
Mgbe ị g'akpọ ndị kwere ekwe,
N'udo n'ụlọ ndị igwe,
Cheta m o, cheta m o,
A bụ m onye kwere.
VERSE 4
Onye iro bịara izuru,
Onye iro bịara k'o gbue,
Ka o bibisia ụmụ nke Chukwu,
Chi m o, ekwela,
Chukwu, ekwela,
K'onye iro mkpụrụ obi metụ m aka,
K'onye iro mkpụrụ obi metụ m aka.