Full Lyrics
CHORUS
Jesu chekwaba mkpul'obi m o
Jesu chekwaba mkpul'obi m n'ụlọ Gị doo
Ị gaghị ekwe ka mkpul'obi m reure
n'ala ndị mmụọ.
VERSE 1
Mkpul'ob'I kere n'oyiyi Gị
Jesu
Kere n'ụdị anwụghị anwụ.
Leenụ k'o togboro
Jesu ọ gaghị erena t'ure
n'ili ọnwụ.
VERSE 2
Chukwu a hapụghị nwa Ya k'ọ r'ure n'ili
Chukwu hapụghị nwa Ya ka ọ la n'iyi
Chukwu meri r'ili merie ọnwụ merie mmehie
Chekwab'obim o n'ebensọ Gị
VERSE 3
Mgbe I g'akpọ ndị kwerekwe
n'ụda opike nk'igwe,
Mgbe I g'akpọ ha n'ọgbara ndị nsọ zị
Chetam o Jesu chetam o
Chetam o abụm onye kwere
VERSE 4
Ony'iro bịara izuru,
Ony'iro bịara ka ogbue, ka o bibisia
ụmụ nke Chukwu, Chi m o ekwela Chukwu
ekwela ka onyiro mkpur'obi metụ m aka.