Full Lyrics
VERSE 1
Miri nke ndụ naezo sike
Ifufe nke ndụ naefe sike
Ebili miri naagbara
Jupụtara ebe nile n'ụwa
CHORUS
Chebem o, chebe nwa gị
Chebem o
Nna, na nma ma na njọ
Nna, chebe nwa gị
VERSE 2
Ekwensu dika oke ọdụm,
Nke naagbọ ụja nke iwe dị,
Naejegharị naesedum
Naachọsike onye ọ gaelomi
VERSE 3
Ndị isi nkwusa na ndị d'ike
Ndị diakụ na ndị maihe
Ndịa naezipụta onwe ha
Mana ndị ọnọdụ ha dị ala
VERSE 4
Biko k'obim dị n'aka Gị
K'ụzọm bụrụ nke I ziri,
Kam wesoro na ndo nku Gị
Ebe udo n'ọṅụ zur'oke dị