Full Lyrics
Chineke bụ onye nche m,
Chineke bụ onye nche m,
O nwekwaghị ihe m g'achọ.
Chineke bụ onye nche m,
O nweghịkwa ihe m g'achọ.
Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka o n'enye m ezumike,
O n'edu ga m n'amiri kam zurike,
Kam were kutu ume.
VERSE 2
O n'edu m n'ụzọ nke kwụ ọtọ
Ka aha ya si dị.
Ọ bụrụgodụ na m daga n'ọchịchịrị,
Egwu agaghị atụ m o.
BASS SOLO
I ji mkpara na ọgụgị kwadoro m nso,
Ọ bụ ha n'enye m aṅụrị.
Ke m g'eri n'ihu ndị irom.
I ji aka gị tee m ude n'isi,
Iko mmanya m ejula n'ọnụ.
VERSE 4
Ịhụnanya na obi ọma gaeso m,
Ụbọchị nke ndụ m niile.
A ga m ebi n'ụlọ nke Chineke,
Biri na ya ebebe.