ABU OMA 121 by Chidi Ezeigwe — Lyrics

Chidi Ezeigwe Igbo Responsorial Psalms Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

M'ge weli anya m'abụọ lee ugwu nile, lee ugwu nile. O lee ebe inyeaka m g'esi bịa? Inyeaka m g'esi n'aka Chineke bịa, Onye mewere eluigwe na ụwa. Ya y'ekwela ka ewezug' ụkwụ gị n'ọnọdụ ya, o n'ọnọdụ ya, onye n'edobe gị yaatụla ọrụ ụra. Ọ dighị arahụ kwụra bụ onye n'edobe Israel. Chineke bụ Onye n'edobe gị, Chineke bụ ndò gị n'aka nri gị. Anyanwụ agaghị etigbukwa gị n'ehihie, Ọnwa agaghị etigbukwa gị n'abalị. Chineke g'edebe gị ka ihe ọjọọ bula gharidakwasị gị. Chineke g'edobe ọpụpụ gị, Ọpụpụ gị na mbata gị site ugbua rue mgbe ebighiebi.

Download the sheet music

ABU OMA 121

ABU OMA 121

By Chidi Ezeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Responsorial Psalms Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want