Full Lyrics
[Chorus]
Nwa Chineke! Ekwela ka ihe ọbụla nye gị nsogbu,
ekwela ka ihe ọbụla tụọ gị ụjọ;
Ihe dum n'agafe agafe;
Chineke adịghị agbanwe agbanwe;
Iji ndidi g'enye gị ihe nile.
Onye nwere Chineke, onweghị ihe kọrọ ya;
sọsọ Chukwu ezuola.
Lawa lawa, Corona virus lawa,
ụmụ Chineke nọ na nchekwa Chukwu.
Lawa lawa, Corona virus lawa,
ụmụ Chineke nọ na nchekwa Chukwu.
[Verse 1]
Ụwa nọ na nsogbu, ụwa nọ n'ọgbaaghara,
Ụjọ nọ n'ebe nile ma Chukwu n'asị gị dere juu.
[Verse 2]
Kwere na Chukwu, dabere na ya,
Ọ bụ onye nwe gị, ọ sị gị atụla ụjọ.